MY AFRICAN QUEEN: She rose so gracefully like a scudding smoke. Drew a long refreshing breath....

MY AFRICAN QUEEN: She rose so gracefully like a scudding smoke. Drew a long refreshing breath....
and she drove her waist, and flew the tassels of her queenly apparel. The silent music mussed on! Her dainty dazzling hairs caressing her hip. Bare-footed, her virgin beautiful feet tip-toed to the unheard sweet songs. Her fingers like that of eagle’s wings, high on the naked tune’s wave and breath. Then she danced like the wind o'er the serene sea of my Africa, my Mother!

Monday, June 22, 2009

Happy Fathers Day


Chineke Nna puru ime ihe nile, Eze di ebube di ngozi, anyi na-ario gi ka I goziere anyi oji nkea. Oji di otu mana o na-agba n’ibe; nkea na-egosi udo na ihunanya. Bia taa n’otu ka anyi taa n’ibe. Akidi miara anyi ya mikwara nwunye di anyi, ka anyi doo ahu wee rie nke anyi.

Biko chekwaba ndi nna anyi, ndi no n’ulo na ndi no n’ama. Mee ka ha di n’otu na-ahurita onwe ha n’anya. Nye ndi nna nile ike ichikota ezi na ulo ha. Ka onye nna obula hu nwunye ya n’anya karia ihe nile, Makwara na nwanyi bu ugo di ya ooo!

Chi omumu, biko ekwekwala ka ihe ha ga-eji azulite umu ha koo ha. Ka nzube ha mezuo n’isi umu ha nile- ndi dokinta, ndi nkuzi, ndi loya; onye na nke ya, onye na nke ya. Ngu onye ji eko, akwanaghi ya. Ma ota aku n’nkume, okpa nkata n’ohia. Onye na-egbukwe ya na-eze maka o gbuo, ogbupughi e gburu ya. Ya mere Olisa bi n’igwe anyi ayo ka igozie, ma chekwa ndi nna anyi site na Chrisi Eze anyioooo Iseeeeeeee!!!

Dube ha oooo, opupu ha na mbata ha oooo. Iseeee! Ha kpata ero, ha kpata eju, nke ga-akpata ha gbaba n’ohia ka ukpaka chuputara anyi nke anyi ga-eri oooo Iseeee!! Ihe aku aku, ihe enwe enwe oooo, ndu onye ukwu ooo, ndu onye nta oooo na aha nwafo Chrisi Christi Eze anyi oooo Amioooo.


In dedication to our Fathers and may the souls of all our departed ones rest in peace Amen.

Ositadimma

0 comments: